Bitcoin ọ bụ ezigbo ụzọ ị ga-esi mụbaa ego gi?

nkeji 23 gara aga

Bitcoin

Bitcoin bụzi ihe onye ukwu na onye nta kpụ n’ọnụ taa gbasara okwu mmuba akụnụba nke Bekee kpọrọ ‘investment’.

Onye ntorobịa ọbụla ị kpara aka n’ọnụ ugbua, ọ sị gị na ya etinyela ego ya na Bitcoin.

Mana gịnị bụ Bitcoin?

Ọnụahịa otu mkpụrụ Bitcoin na naịra nakwa dọla
Nkọwa foto,

Ọnụahịa otu mkpụrụ Bitcoin na naịra nakwa dọla

Bitcoin bụ ụdị ego anaghị ahụ anya; Bekee kpọrọ ya ‘Digital Currency’ maọbụ ‘Virtual Currency’ maọbụ ‘Cryptocurrency’.

E wepụ Bitcoin, ha dị ọtụtụ ụdị ego a e nwere. Ndị ọzọ niile ahụ ka a na-akpọ ‘Altcoins’.

Mana Bitcoin bụ nke ndị mmadụ kacha mara ma bụrụkwa nke kacha ọnụahịa.

ATM Bitcoin

Nkọwa foto,

N’ụlọahịa ụfọdụ dị na mba Yurop, i nwere ike ịhụ igwe ị ga-eji were bitcoi kwụọ ụgwọ nke Bekee kpọrọ ‘ATM’

Otu mkpụrụ Bitcoin karịrị nde naịra anọ (N4 million)

Ọ bụ n’afọ 2009 ka otu onye kpọrọ onwe ya Satoshi Nakamoto wepụtara atụmatụ Bitcoin, mana onweghị onye ma kpọmkwem onye nwoke ahụ bụ ruo taa.

Etu e si eji Bitcoin azụkọrịta ahịa

Naira-Yuan

Nkọwa foto,

Bitcoin abụghị ego a na-ahụ anya dịka naịra maọbụ dọla

N’ihi na Bitcoin abụghị ego a na-ahụ anya, ọ bụ n’igwe kọmputa na ịntanetị ka e si ekesa ya.

Onweghị gọọmentị mba ọbụla maọbụ ụlọakụ ọbụla na-ahazi etu e si eji Bitcoin azụahịa.

Naanị ndị a na-akpọ ‘Miners’ bụ ndị na-emepụta ya ma na-ahazikwa etu e si eji ya azụkọrịta ahịa.

Blockchain
Nkọwa foto,

Ndị ọkacha mara ekwuola na tekịnụzụ a kpọrọ ‘Blockchain’ ga-abụ nnukwu ihe n’ọdịnihu

Etu e si emepụta ụdị ya bụ usoro teknụzụ bụ ọgbaraIgbogharịị a na-akpọ ‘Blockchain’ na Bekee.

Ịkọwa teknụzụ ‘Blockchain’ ga-abụ akụkọ nke aka ya.

Nke a kpatara o ji dị mkpa na mmadụ ga-elezi anya nke ọma tupu o tinye ego ya na Bitcoin maọbụ ‘cryptocurrency’ ndị ọzọ, iji gbaara okwu na ụka ọsọ.

I nwere ike iji Bitcoin zụta ihe na Naịjirịa?

Ọ dịchabeghị mfe mmadụ iji Bitcoin ga zụrụ ọgọdọ maọbụ akpa osikapa n’ahịa Naịjirịa, mana ihe e ji ya eme buru ibu.

Ihe e jikarị ya eme bụ ichekwaba ego nakwa iziga ego si otu mba gaa mba ọzọ.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi

Aha onyonyo,

Personal Finance: Ebe asaa i nwereike itinye ego ị tụkọtara

E nwere ụlọọrụ dị icheiche ọrụ ha bụ inyere ndị mmadụ aka ịzụta Bitcoin maọbụ ịgbanwe nke ha nwere nye ha naịra maọbụ dọla.

Mana tupu itinye ego gị, anya saa.

N’aka nke ọzọ, i nwere ike iji Bitcoin zụta ihe na mba dị icheiche dịka Japan, Switzerland, Germany, Singapore dịrị gawazie.

Ihe ndị ọkacha mara kwuru maka Bitcoin

Cryptocurrency

Nkọwa foto,

E nwekwara ‘cryptocurrency’ dị icheiche ma e wepụ Bitcoin. Ha gụnyere Ethereum, Litecoin, Ripple na ndị ọzọ

Adedayo Adebajo, bụ onye ihe gbasara teknụzụ ‘Blockchain’ doro anya nke ọma, kọwaara BBC na tupu itinye ego na ‘cryptocurrency’:

  • Mata na ọ yitekwara ụzọ ndị ọzọ e ji amụba ego nke Bekee kpọrọ ‘investment’. Ọ pụtara na ego gị nwere ike ịmụba, o nwekwara ike ịla.
  • Zeere ndị ọnụ ụtọ na-agwa gị na ego gị ga-amụba n’otu ntabi anya
  • Mee nnyocha gị nke ọma gbasara ụlọọrụ ahụ ịchọrọ itinye ego gi na ya
  • Mara ma ụlọọrụ ebe ị chọrọ itinye ego gị ha esokwa n’otu ndị dịka:

Bitcoin o ziri ezi n’iwu Naịjirịa?

CBN

Nkọwa foto,

Ụlọakụ etiti dọrọ aka na ntị ka ndị na-etinye ego ha na Bitcoin hie asaa n’anya.

Ka ọ dị ugbua, onweghị iwu ọbụla machiri mmadụ itinye ego ya na Bitcoin maọbụ ‘cryptocurrency’ ndị ọzọ na Naịjirịa, mana onwekwaghị iwu ọbụla na-akwado ya.

Ha kwuru sị: “Onweghi iwu ọbụla na-echekwa ndị ọbụla tinyere ego ha na ‘cryptocurrency’.

Godwin Emefiele na Lamido Yuguda
Nkọwa foto,

Oyeisi úlóakú etiti bú Godwin Emefiele na onyeisi ngalaba ‘Securities and Exchange Commission’ bụ Lamido Yuguda

“Anyị na-adọ ndị mmadụ aka na ntị na cryptocurrency abụghị usoro iwu kwadoro maka azụmahịa na Naịjirịa.”

“Onye ọbụla ego ya furu na cryptocurrency, onweghị ebe onye ahụ ga-aga mee mkpesa, ọ pụtara na ego ahụ alaala.”

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi

Aha onyonyo,

Nwaanyị na-ama ’tile’

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *